5 m ga-emekwa ka ocheeze nke alaeze gị n’Izrel guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi, dị nnọọ ka m kwere Devid nna gị nkwa, sị, ‘Ọ dịghị mgbe a na-agaghị enwe nwoke si n’ahụ́ gị nọ n’ocheeze Izrel.’+
5 “Lee! Oge na-abịa,” ka Jehova kwuru, “mgbe m ga-eme ka ome ezi omume puoro Devid.+ Otu eze ga na-achị+ ma jiri ezi uche na-eme ihe, na-ekpekwa ikpe ziri ezi ma na-eme ezi omume n’ala a.+