31 O wee kpọpụta ndị bi n’ime ya ka o wee nye ha ọrụ ịwa nkume nakwa iji ngwá ọrụ na-aghọ nkọ ndị e ji ígwè mee+ na anyụike na-arụ ọrụ, o mekwara ka ha na-akpụ brik. Ọ bụkwa otú ahụ ka o mere obodo niile nke ụmụ Amọn. N’ikpeazụ, Devid na ndị niile ya na ha so laghachiri Jeruselem.