22 Jehova ga-eme ka ị rịawa ụkwara nta+ na oké ahụ́ ọkụ na ọrịa ahụ́ ọzịza na oké okpomọkụ, meekwa ka mma agha+ bịakwasị gị, meekwa ka ihe ọkụkụ gị kpọnwụọ,+ meekwa ka ihe ọkụkụ gị maa ebù,+ ihe ndị a ga-achụkwa gị ọsọ ruo mgbe ị lara n’iyi.
13 Gad wee bakwuru Devid sị ya:+ “Ị̀ chọrọ ka ụnwụ daa n’ala gị ruo afọ asaa,+ ka ọ̀ bụ ka ị na-agba ọsọ n’ihu ndị iro gị ruo ọnwa atọ,+ ha ana-achụ gị, ka ọ̀ bụ ka e nwee ọrịa na-efe efe n’ala gị ruo ụbọchị atọ?+ Chebara ya echiche ka m mara ihe m ga-aza Onye zitere m.”