Nehemaya 5:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ma ndị bụ́ gọvanọ tupu mụ onwe m boro ndị anyị ibu arọ, ha nọkwa na-anara ha shekel ọlaọcha iri anọ maka nri na mmanya kwa ụbọchị. Ndị na-ejere ha ozi chịkwara ndị anyị ọchịchị nchịgbu.+ Ma mụ onwe m emeghị otú ahụ+ n’ihi egwu Chineke.+ Job 31:23 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 23 N’ihi na ọdachi nke si n’aka Chineke mere ka ụjọ jide m,Apụghịkwa m iguzogide ebube ya.+ Ilu 1:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ịtụ egwu Jehova bụ mmalite ihe ọmụma.+ Ọ bụ amamihe na ịdọ aka ná ntị ka ndị nzuzu leghaara anya.+
15 Ma ndị bụ́ gọvanọ tupu mụ onwe m boro ndị anyị ibu arọ, ha nọkwa na-anara ha shekel ọlaọcha iri anọ maka nri na mmanya kwa ụbọchị. Ndị na-ejere ha ozi chịkwara ndị anyị ọchịchị nchịgbu.+ Ma mụ onwe m emeghị otú ahụ+ n’ihi egwu Chineke.+