4 Ya mere, eze gara Gibiọn+ ịchụ àjà n’ebe ahụ, n’ihi na ebe ahụ bụ nnukwu ebe dị elu.+ Sọlọmọn wee jiri otu puku anụ chụọ àjà nsure ọkụ n’elu ebe ịchụàjà ahụ.+
63 Sọlọmọn wee chụọ àjà udo+ ndị o kwesịrị ịchụrụ Jehova, ya bụ, ehi dị puku iri abụọ na puku abụọ na atụrụ dị otu narị puku na iri puku abụọ,+ ka eze na ụmụ Izrel niile wee rara ụlọ Jehova nye.+
21 Ha wee na-achụrụ+ Jehova àjà nkịtị, na-achụkwara Jehova àjà nsure ọkụ+ n’echi ya, ya bụ, otu puku oké ehi, otu puku ebule, otu puku ụmụ ebule, na àjà ihe ọṅụṅụ ha,+ chụọkwa ọbụna àjà dị ukwuu maka Izrel dum.+