11 Arịa ọlaedo na arịa ọlaọcha niile dị puku ise na narị anọ. Sheshbaza+ bugotere ihe niile, o sikwa Babịlọn kpọpụta ndị a dọọrọ n’agha+ kpọta ha Jeruselem.
14 Arịa ọlaedo na nke ọlaọcha+ nke ụlọ Chineke, bụ́ ndị Nebukadneza bupụtara n’ụlọ nsọ ahụ dị na Jeruselem, wee bute ha n’ụlọ nsọ Babịlọn,+ ọ bụ ihe ndị a ka eze Saịrọs+ bupụtara n’ụlọ nsọ Babịlọn nyefee Sheshbaza,+ bụ́ aha onye o mere gọvanọ.+
2 Ka oge na-aga, Jehova nyefere Jehoyakim eze Juda+ na ụfọdụ n’ime arịa+ ndị dị n’ụlọ ezi Chineke n’aka ya, o wee bute ha n’ala Shaịna,+ n’ụlọ chi ya; o wee busa arịa ndị ahụ n’ụlọ a na-edebe akụ̀ nke chi ya.+
2 Mgbe mmanya gbuwere Belshaza,+ o kwuru ka a chịtara ya arịa ọlaedo na nke ọlaọcha+ ndị Nebukadneza nna ya chịịrị n’ụlọ nsọ dị na Jeruselem, ka eze na ndị ukwu ya, ndị iko ya na ndị nwunye ya ndị ọzọ were ha ṅụọ mmanya.+