23 N’ihu Jehova bụ́ Chineke gị, n’ebe ọ ga-ahọrọ ka aha ya biri, ka ị ga-eri otu ụzọ n’ụzọ iri nke ọka gị,+ nke mmanya ọhụrụ gị na nke mmanụ gị na nke anụ ndị e bu ụzọ mụọ n’ìgwè ehi gị na n’ìgwè ewu na atụrụ gị;+ ka i wee mụta ịtụ egwu Jehova bụ́ Chineke gị mgbe niile.+