17 Ma a ga-enye Izrel nzọpụta ga-adịru mgbe ebighị ebi+ n’ihi na ya na Jehova dị n’otu.+ Ihere agaghị eme unu,+ a gaghịkwa emechu unu ihu+ ruo mgbe niile ebighị ebi.
7 Ma m ga-emere ụlọ Juda ebere,+ mụ onwe m, bụ́ Jehova Chineke ha, ga-azọpụta ha;+ ma ọ bụghị ụta ma ọ bụ mma agha ma ọ bụ agha ma ọ bụ ịnyịnya ma ọ bụ ndị na-agba ịnyịnya ka m ga-eji zọpụta ha.”+