17 Ma a ga-enye Izrel nzọpụta ga-adịru mgbe ebighị ebi+ n’ihi na ya na Jehova dị n’otu.+ Ihere agaghị eme unu,+ a gaghịkwa emechu unu ihu+ ruo mgbe niile ebighị ebi.
18 Ka ihere mee ndị na-akpagbu m,+ ma ekwela ka ihere mee m.+ Ka ọ bụrụ ha ka ụjọ ga-ejide, ma ekwela ka ụjọ jide m. Mee ka ụbọchị ọdachi bịakwasị ha,+ mee ka ọkpụkpụ ha gbajisịa ọbụna okpukpu abụọ.+