Ọnụ Ọgụgụ 10:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 “N’ụbọchị unu na-aṅụrị ọṅụ+ nakwa n’oge ememme+ unu nakwa ná mbido ọnwa unu,+ unu ga-afụ opi maka àjà nsure ọkụ+ unu nakwa àjà udo unu;+ ịfụ ha ga-abụrụ unu ihe ncheta n’ihu Chineke unu. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.”+ Ọnụ Ọgụgụ 23:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Ọ dịghị ike anwansi+ ọ bụla ọ hụrụ megide Jekọb,Ọ dịghịkwa nsogbu ọ bụla ọ hụrụ megide Izrel.Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ya,+Mkpu otuto a na-etiri eze na-ada n’etiti ya. Abụ Ọma 98:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Jirinụ opi na ụda opi+Tie mkpu mmeri n’ihu Eze, bụ́ Jehova.
10 “N’ụbọchị unu na-aṅụrị ọṅụ+ nakwa n’oge ememme+ unu nakwa ná mbido ọnwa unu,+ unu ga-afụ opi maka àjà nsure ọkụ+ unu nakwa àjà udo unu;+ ịfụ ha ga-abụrụ unu ihe ncheta n’ihu Chineke unu. Abụ m Jehova bụ́ Chineke unu.”+
21 Ọ dịghị ike anwansi+ ọ bụla ọ hụrụ megide Jekọb,Ọ dịghịkwa nsogbu ọ bụla ọ hụrụ megide Izrel.Jehova bụ́ Chineke ya nọnyeere ya,+Mkpu otuto a na-etiri eze na-ada n’etiti ya.