Abụ Ọma 40:11 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 11 Gị onwe gị, Jehova, biko, ahapụla inwere m ọmịiko.+Ka obiọma gị nakwa eziokwu gị na-eche m nche mgbe niile.+ Abụ Ọma 57:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Ọ ga-esi n’eluigwe zite enyemaka wee zọpụta m.+Ọ ga-eme ka onye na-anwa iji ọnụ kpụrụ m nwee mgbagwoju anya.+ Sila.Chineke ga-ezite obiọma* ya na eziokwu ya.+ Abụ Ọma 61:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ọ ga-ebi n’ihu Chineke ruo mgbe ebighị ebi;+Biko, zite obiọma* na eziokwu, ka ha wee chebe ya.+ Abụ Ọma 86:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ma gị onwe gị, Jehova, bụ Chineke nke na-eme ebere, onye na-eme amara,+Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.+ Ilu 20:28 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 28 Obiọma na eziokwu na-echebe eze;+ o jiriwokwa obiọma mee ka ocheeze ya guzosie ike.+
11 Gị onwe gị, Jehova, biko, ahapụla inwere m ọmịiko.+Ka obiọma gị nakwa eziokwu gị na-eche m nche mgbe niile.+
3 Ọ ga-esi n’eluigwe zite enyemaka wee zọpụta m.+Ọ ga-eme ka onye na-anwa iji ọnụ kpụrụ m nwee mgbagwoju anya.+ Sila.Chineke ga-ezite obiọma* ya na eziokwu ya.+
15 Ma gị onwe gị, Jehova, bụ Chineke nke na-eme ebere, onye na-eme amara,+Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.+