Ekpere Devid.
86 Jehova, biko, tọọ ntị n’ala. Za m,+
N’ihi na anọ m n’ahụhụ, adakwara m ogbenye.+
2 Chebe mkpụrụ obi m, n’ihi na m na-eguzosi ike n’ihe.+
Zọpụta ohu gị nke tụkwasịrị gị obi+—ị bụ Chineke m.
3 Jehova, biko, meere m amara,+
N’ihi na ọ bụ gị ka m na-akpọku ogologo ụbọchị dum.+
4 Mee ka mkpụrụ obi ohu gị ṅụrịa ọṅụ,+
N’ihi na ọ bụ gị, Jehova, ka m na-enye mkpụrụ obi m.+
5 N’ihi na gị onwe gị, Jehova, dị mma,+ dịkwa njikere ịgbaghara mmehie;+
Obiọma ị na-egosi ndị na-akpọku gị dị ukwuu.+
6 Jehova, biko, gee ntị n’ekpere m;+
Ṅaakwa ntị n’olu arịrịọ m.+
7 M ga-akpọku gị n’ụbọchị m nọ n’ahụhụ,+
N’ihi na ị ga-aza m.+
8 Ọ dịghị onye dị ka gị n’etiti chi niile, Jehova,+
Ọ dịghịkwa ọrụ yiri ọrụ gị.+
9 Mba niile i kere ga-abịa,+
Ha ga-akpọkwa isiala n’ihu gị, Jehova,+
Nyekwa aha gị otuto.+
10 N’ihi na ị dị ukwuu, na-emekwa ihe ndị dị ebube;+
Ọ bụ naanị gị bụ Chineke.+
11 Jehova, biko, kụziere m ụzọ gị.+
M ga-eje ije n’eziokwu gị.+
Mee ka obi m dị n’otu ịtụ egwu aha gị.+
12 M ji obi m dum na-eto gị, Jehova Chineke m,+
M ga-enyekwa aha gị otuto ruo mgbe ebighị ebi,
13 N’ihi na obiọma ị na-egosi m dị ukwuu,+
Ị napụtawokwa mkpụrụ obi m na Shiol, bụ́ ebe dị n’ime ime ala.+
14 Chineke, ndị mpako ebiliwo imegide m;+
Ìgwè ndị na-eme ihe n’aka ike na-achọ mkpụrụ obi m,+
Ha adịghịkwa eme ka ị nọrọ n’ihu ha.+
15 Ma gị onwe gị, Jehova, bụ Chineke nke na-eme ebere, onye na-eme amara,+
Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ,+ onye obiọma ya na eziokwu ya dị ukwuu.+
16 Chee ihu n’ebe m nọ ma meere m amara.+
Nye ohu gị ike gị,+
Zọpụtakwa nwa ohu gị nwaanyị.+
17 Mee ka ịdị mma gị pụta ìhè n’ahụ́ m,
Ka ndị kpọrọ m asị wee hụ ya, ihere ewee mee ha.+
N’ihi na gị onwe gị, Jehova, enyeworo m aka, kasiekwa m obi.+