23 Ndị isi gị dị isi ike, bụrụkwa enyi ndị ohi.+ Onye ọ bụla n’ime ha hụrụ iri ngarị n’anya,+ ha na-achụsokwa onyinye.+ Ha adịghị ekpe nwa na-enweghị nna ikpe ziri ezi; ha adịghịkwa anụrụ ọbụna okwu ikpe nke nwaanyị di ya nwụrụ.+
12 Ha eriwo ngarị n’ime gị iji wụfuo ọbara.+ Ị narawokwa ọmụrụ nwa+ na ụma.+ I jikwa ime ihe ike na-enweta uru+ site n’irigbu ndị ibe gị,+ i chefuwokwa m,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru.
12 N’ihi na amaara m ugboro ole unu nupụrụ isi+ nakwa otú mmehie unu jọruru ná njọ,+ unu ndị na-ebuso onye ezi omume iro,+ unu ndị na-anara ego aka azụ,+ ndị kwapụwokwara ụmụ ogbenye n’akụkụ+ ọbụna n’ọnụ ụzọ ámá.+