Levitikọs 25:35 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 35 “‘Ọ bụrụkwa na nwanne gị nke bi gị nso adaa ogbenye,+ o nweghịkwa ego, ị ga-enye ya ihe na-akpa ya.+ Dị ka onye mbịarambịa na onye ọbịa,+ ọ ga-eso gị dịrị ndụ. Diuterọnọmi 15:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụnne gị adaa ogbenye n’etiti unu n’otu n’ime obodo gị, n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, akpọchila obi gị, emerela nwanne gị bụ́ ogbenye aka ntagide.+ Abụ Ọma 37:26 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 26 Ọ na-eme amara ogologo ụbọchị dum, na-agbazinyekwa ihe,+N’ihi ya, ụmụ ya ga-enweta ngọzi.+ Abụ Ọma 112:5 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 5 Onye na-eme amara,+ nke na-agbazinyekwa mmadụ ihe,+ bụ ezigbo mmadụ. י [Yod]Ọ na-eji ikpe ziri ezi eme ihe ndị ọ na-eme.+ 2 Timoti 1:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Ka Onyenwe anyị meere ezinụlọ Onesịfọrọs+ ebere, n’ihi na mgbe mgbe o mere ka m nwee ume,+ ihere agbụ ígwè m emeghịkwa ya.+ Ndị Hibru 13:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Unu echefukwala ime ihe ọma+ na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.+
35 “‘Ọ bụrụkwa na nwanne gị nke bi gị nso adaa ogbenye,+ o nweghịkwa ego, ị ga-enye ya ihe na-akpa ya.+ Dị ka onye mbịarambịa na onye ọbịa,+ ọ ga-eso gị dịrị ndụ.
7 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụnne gị adaa ogbenye n’etiti unu n’otu n’ime obodo gị, n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, akpọchila obi gị, emerela nwanne gị bụ́ ogbenye aka ntagide.+
5 Onye na-eme amara,+ nke na-agbazinyekwa mmadụ ihe,+ bụ ezigbo mmadụ. י [Yod]Ọ na-eji ikpe ziri ezi eme ihe ndị ọ na-eme.+
16 Ka Onyenwe anyị meere ezinụlọ Onesịfọrọs+ ebere, n’ihi na mgbe mgbe o mere ka m nwee ume,+ ihere agbụ ígwè m emeghịkwa ya.+
16 Unu echefukwala ime ihe ọma+ na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.+