Diuterọnọmi 15:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụnne gị adaa ogbenye n’etiti unu n’otu n’ime obodo gị, n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, akpọchila obi gị, emerela nwanne gị bụ́ ogbenye aka ntagide.+ Abụ Ọma 41:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 41 Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe;+Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi.+ Ilu 14:21 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 21 Onye na-eleda mmadụ ibe ya anya na-eme mmehie,+ ma obi ụtọ na-adịrị onye na-emere ndị nọ n’ahụhụ amara.+ Ilu 19:17 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 17 Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe,+ Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.+ Ilu 22:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 Onye anya ya na-eme ebere ka a ga-agọzi, n’ihi na o nyetụwo onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya nri ya.+ Aịzaya 58:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Ọ́ bụghị ka i kenye onye agụụ na-agụ ihe oriri,+ ka ị kpọbatakwa ndị nọ n’ahụhụ na ndị na-enweghị ebe obibi n’ụlọ gị?+ Ọ bụrụ na ị hụ onye gba ọtọ, ka i yiwe ya uwe,+ ka ị gharakwa izopụ onwe gị n’ebe onye ikwu gị nọ?+ 2 Ndị Kọrịnt 9:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Ma n’ihe a, onye ji aka ntagide na-agha mkpụrụ+ ga-ejikwa aka ntagide ghọrọ mkpụrụ; onye na-aghakwa mkpụrụ n’ụba+ ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba. Ndị Hibru 13:16 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 16 Unu echefukwala ime ihe ọma+ na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.+
7 “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime ụmụnne gị adaa ogbenye n’etiti unu n’otu n’ime obodo gị, n’ala gị nke Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị, akpọchila obi gị, emerela nwanne gị bụ́ ogbenye aka ntagide.+
41 Obi ụtọ na-adịrị onye ji nghọta na-emeso onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya ihe;+Jehova ga-emere ya ụzọ mgbapụ n’ụbọchị ọdachi.+
21 Onye na-eleda mmadụ ibe ya anya na-eme mmehie,+ ma obi ụtọ na-adịrị onye na-emere ndị nọ n’ahụhụ amara.+
17 Onye na-emere onye ọ na-enweghị ka ọ hà ya amara na-agbazinye Jehova ihe,+ Ọ ga-akwụkwa onye ahụ ụgwọ ihe o mere.+
7 Ọ́ bụghị ka i kenye onye agụụ na-agụ ihe oriri,+ ka ị kpọbatakwa ndị nọ n’ahụhụ na ndị na-enweghị ebe obibi n’ụlọ gị?+ Ọ bụrụ na ị hụ onye gba ọtọ, ka i yiwe ya uwe,+ ka ị gharakwa izopụ onwe gị n’ebe onye ikwu gị nọ?+
6 Ma n’ihe a, onye ji aka ntagide na-agha mkpụrụ+ ga-ejikwa aka ntagide ghọrọ mkpụrụ; onye na-aghakwa mkpụrụ n’ụba+ ga-aghọrọ mkpụrụ n’ụba.
16 Unu echefukwala ime ihe ọma+ na ịdị na-enye ndị ọzọ ihe, n’ihi na àjà ndị dị otú ahụ na-adị Chineke ezi mma.+