Diuterọnọmi 6:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 kụnye ha n’ime ụmụ gị,+ kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala+ nakwa mgbe i biliri ọtọ. Ilu 3:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 n’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba,+ ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya dị ya mma mba.+ Ilu 19:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Nye nwa gị ntaramahụhụ mgbe olileanya ka dị;+ ekwekwala ka igbu ya gụọ mkpụrụ obi gị agụụ.+ Ilu 22:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata;+ ọ bụ ụtarị ịdọ aka ná ntị ga-ewepụ ya n’ebe dị anya n’ebe ọ nọ.+ Ilu 23:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 I kwesịrị ịpịa ya ụtarị, ka i wee napụta mkpụrụ obi ya na Shiol.+ Ndị Efesọs 6:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Unu ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe,+ kama na-azụlitenụ ha+ n’ọzụzụ+ na nduzi echiche+ nke si n’aka Jehova. Ndị Hibru 12:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 n’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị; n’eziokwu, ọ na-apịa onye ọ bụla ọ nabatara ịbụ nwa ya ihe.”+
7 kụnye ha n’ime ụmụ gị,+ kwuokwa okwu banyere ha mgbe ị nọ ọdụ n’ụlọ gị na mgbe ị na-eje ije n’okporo ụzọ na mgbe i dina ala+ nakwa mgbe i biliri ọtọ.
12 n’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-abara mba,+ ọbụna dị ka nna si abara nwa ya nke ihe ya dị ya mma mba.+
15 Nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata;+ ọ bụ ụtarị ịdọ aka ná ntị ga-ewepụ ya n’ebe dị anya n’ebe ọ nọ.+
4 Unu ndị bụ́ nna, unu emela ụmụ unu ihe iwe,+ kama na-azụlitenụ ha+ n’ọzụzụ+ na nduzi echiche+ nke si n’aka Jehova.
6 n’ihi na onye Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị; n’eziokwu, ọ na-apịa onye ọ bụla ọ nabatara ịbụ nwa ya ihe.”+