Ilu 13:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Onye na-adịghị apịa nwa ya ụtarị kpọrọ ya asị,+ ma onye hụrụ ya n’anya na-ahụ na a dọrọ ya aka ná ntị.+ Ilu 19:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 Nye nwa gị ntaramahụhụ mgbe olileanya ka dị;+ ekwekwala ka igbu ya gụọ mkpụrụ obi gị agụụ.+ Ilu 23:14 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 14 I kwesịrị ịpịa ya ụtarị, ka i wee napụta mkpụrụ obi ya na Shiol.+ Ilu 29:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ọ bụ ụtarị na ịdọ aka ná ntị na-enye amamihe;+ ma nwata a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya ga na-emenye nne ya ihere.+ Ndị Hibru 12:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 N’ihi na ruo ụbọchị ole na ole, ha na-adọ anyị aka ná ntị dị ka o si dị ha mma,+ ma ọ na-eme otú ahụ n’ihi ọdịmma anyị ka anyị wee keta òkè n’ịdị nsọ ya.+
24 Onye na-adịghị apịa nwa ya ụtarị kpọrọ ya asị,+ ma onye hụrụ ya n’anya na-ahụ na a dọrọ ya aka ná ntị.+
15 Ọ bụ ụtarị na ịdọ aka ná ntị na-enye amamihe;+ ma nwata a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya ga na-emenye nne ya ihere.+
10 N’ihi na ruo ụbọchị ole na ole, ha na-adọ anyị aka ná ntị dị ka o si dị ha mma,+ ma ọ na-eme otú ahụ n’ihi ọdịmma anyị ka anyị wee keta òkè n’ịdị nsọ ya.+