1 Samuel 3:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Gwa ya na m na-ekpe ụlọ ya ikpe+ ruo mgbe a na-akaghị aka n’ihi njehie nke ọ maara,+ n’ihi na ụmụ ya na-akọcha Chineke,+ ọ baghịkwara ha mba.+ Ilu 13:24 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 24 Onye na-adịghị apịa nwa ya ụtarị kpọrọ ya asị,+ ma onye hụrụ ya n’anya na-ahụ na a dọrọ ya aka ná ntị.+ Ilu 22:6 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 6 Zụlite nwata dị ka ụzọ kwesịrị ya si dị;+ ọbụna mgbe o mere okenye, ọ gaghị ahapụ ya.+ Ilu 22:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata;+ ọ bụ ụtarị ịdọ aka ná ntị ga-ewepụ ya n’ebe dị anya n’ebe ọ nọ.+ Ilu 23:13 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 13 Ahapụla ịdọ nwatakịrị aka ná ntị.+ Ọ bụrụ na ị pịa ya ụtarị, ọ gaghị anwụ. Ilu 29:15 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 15 Ọ bụ ụtarị na ịdọ aka ná ntị na-enye amamihe;+ ma nwata a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya ga na-emenye nne ya ihere.+ Ndị Hibru 12:7 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 7 Unu na-atachi obi ka e wee dọọ unu aka ná ntị.+ Chineke na-emeso unu dị ka ụmụ.+ N’ihi na olee nwa nke nna ya na-adịghị adọ aka ná ntị?+
13 Gwa ya na m na-ekpe ụlọ ya ikpe+ ruo mgbe a na-akaghị aka n’ihi njehie nke ọ maara,+ n’ihi na ụmụ ya na-akọcha Chineke,+ ọ baghịkwara ha mba.+
24 Onye na-adịghị apịa nwa ya ụtarị kpọrọ ya asị,+ ma onye hụrụ ya n’anya na-ahụ na a dọrọ ya aka ná ntị.+
15 Nzuzu ka e kekọtara ya na obi nwata;+ ọ bụ ụtarị ịdọ aka ná ntị ga-ewepụ ya n’ebe dị anya n’ebe ọ nọ.+
15 Ọ bụ ụtarị na ịdọ aka ná ntị na-enye amamihe;+ ma nwata a hapụrụ ka ọ na-eme otú masịrị ya ga na-emenye nne ya ihere.+
7 Unu na-atachi obi ka e wee dọọ unu aka ná ntị.+ Chineke na-emeso unu dị ka ụmụ.+ N’ihi na olee nwa nke nna ya na-adịghị adọ aka ná ntị?+