-
Ọpụpụ 18:21Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
21 Ma gị onwe gị ga-esi n’etiti ndị Izrel niile họpụta ndị ikom ruru eru,+ ndị na-atụ egwu Chineke,+ ndị ikom a pụrụ ịtụkwasị obi,+ ndị kpọrọ uru na-ezighị ezi asị;+ ị ga-emekwa ka ha bụrụ ndị isi nke otu puku otu puku mmadụ,+ na ndị isi nke otu narị otu narị mmadụ, ndị isi nke iri mmadụ ise iri mmadụ ise na ndị isi nke mmadụ iri mmadụ iri.+
-
-
Diuterọnọmi 1:15Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
15 M wee kpọrọ ndị isi nke ebo unu niile, ndị ikom maara ihe ma nwee ahụmahụ, wee mee ha ndị isi unu, ndị isi nke otu puku otu puku ndị agha na ndị isi nke otu narị otu narị ndị agha na ndị isi nke ndị agha iri ise ndị agha iri ise na ndị isi nke ndị agha iri ndị agha iri nakwa ndị na-elekọta ebo unu.+
-