26 M ga-eme ka ndị na-emegbu gị rie anụ onwe ha; ọbara ha ga na-egbu ha dị ka mmanya dị ụtọ. Anụ ahụ́ niile ga-amarakwa na mụ onwe m, Jehova,+ bụ Onye Nzọpụta gị+ na Onye Mgbapụta gị,+ Dike nke Jekọb.”+
16 Ị ga-aṅụ ara nke mba dị iche iche.+ Ị ga-amịkwa ara ndị eze.+ Ị ga-amara na mụ onwe m, Jehova,+ bụ Onye Nzọpụta gị,+ nakwa na Dike+ nke Jekọb bụ Onye Mgbapụta gị.+