23 “Nke a bụ ihe Saịrọs eze Peshia+ kwuru, ‘Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe enyewo m+ alaeze niile nke ụwa. Ya onwe ya enyewokwa m ọrụ iwuru ya ụlọ na Jeruselem, nke dị na Juda.+ Onye ọ bụla n’ime unu, n’etiti ndị ya niile,+ ka Jehova bụ́ Chineke ya nọnyere ya.+ Ya lawa.’”+
2 “Nke a bụ ihe Saịrọs eze Peshia kwuru,+ ‘Jehova bụ́ Chineke nke eluigwe+ enyewo m alaeze niile nke ụwa,+ ya onwe ya enyewokwa m ọrụ iwuru ya ụlọ na Jeruselem,+ nke dị na Juda.
3 “N’afọ mbụ nke ọchịchị Eze Saịrọs,+ Eze Saịrọs nyere iwu banyere ụlọ Chineke nke dị na Jeruselem. ‘Ka e wughachi ụlọ ahụ ka ọ bụrụ ebe ha ga na-achụ àjà,+ a ga-atọkwa ntọala ya, ọ ga-adị kubit iri isii n’ịdị elu, dịrịkwa kubit iri isii n’obosara,+
13 “Akpaliwo m otu onye n’ezi omume,+ m ga-emekwa ka ụzọ ya niile kwụrụ ọtọ.+ Ọ bụ ya ga-ewu obodo m,+ ọ ga-ahapụkwa ndị m a dọọrọ n’agha ka ha laa,+ ọ bụghị ka e wee kwụọ ya ụgwọ,+ ọ bụghịkwa ka e wee nye ya ngarị,” ka Jehova nke ụsụụ ndị agha kwuru.