3 Onye ọ bụla n’ime unu, n’etiti ndị ya niile, ka Chineke ya nọnyere ya.+ Ya lawa Jeruselem, nke dị na Juda, ma wughachi ụlọ Jehova bụ́ Chineke Izrel—ọ bụ ya bụ ezi Chineke+—bụ́ ụlọ dị na Jeruselem.+
14 Nke a bụ ihe Jehova, Onye Mgbapụta unu,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ kwuru: “Ọ bụ n’ihi unu ka m ga-eziga ha na Babịlọn ma mee ka ihe e ji tụchie ụlọ mkpọrọ dapụsịa,+ kwatuokwa ndị Kaldia nọ n’ụgbọ mmiri, ha ewee na-eti mkpu ákwá.+
25 Nke a bụ ihe Jehova kwuru: “A ga-anapụ dike ọbụna ndị ọ dọọrọ n’agha,+ ndị onye na-achị n’aka ike kpụụrụ ga-agbalagakwa.+ Onye ọ bụla nke na-alụso gị ọgụ ka m ga-alụso ọgụ,+ m ga-azọpụtakwa ụmụ gị.+