20 Chetanụ okwu m gwara unu, Ohu adịghị aka nna ya ukwu. Ọ bụrụ na ha akpagbuwo m, ha ga-akpagbukwa unu;+ ọ bụrụ na ha edebewo okwu m, ha ga-edebekwa nke unu.
21 N’eziokwu, a kpọrọ unu ka unu soro ụzọ a, n’ihi na ọbụna Kraịst tara ahụhụ n’ihi unu,+ wee hapụrụ unu ihe nlereanya ka unu wee sochie nzọụkwụ ya anya.+
23 Mgbe a na-ekwujọ ya,+ ọ dịghị ekwujọgwara.+ Mgbe ọ na-ata ahụhụ,+ o yighị onye ọ bụla egwu, kama ọ nọ na-enyefe onwe ya n’aka+ onye ahụ nke na-ekpe ikpe ziri ezi.