4 Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba niile,+ doziekwara+ ọtụtụ ndị+ okwu ha. Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.+ Mba agaghị ebuli mma agha buso mba ọzọ agha, ha agaghị amụkwa otú e si alụ agha.+
9 Ọ dịghị ọdụm ga-anọ n’ebe ahụ, ụdị anụ ọhịa ọ bụla nke na-adọgbu adọgbu agaghị abata na ya.+ Ọ dịghị nke a ga-ahụ n’ebe ahụ;+ ọ bụ ndị a gbatara agbata ga na-eje ije n’ebe ahụ.+
18 “A gakwaghị anụ banyere ime ihe ike n’ala gị, ma ọ bụ nụ banyere ibukọrọ ihe mmadụ na itikpọ ihe n’ókè nke ala gị.+ Ị ga-akpọ mgbidi gị Nzọpụta,+ kpọọkwa ọnụ ụzọ ámá gị Otuto.
4 Onye ọ bụla n’ime ha ga-anọdụ n’okpuru osisi vaịn ya nakwa n’okpuru osisi fig ya,+ ọ dịghịkwa onye ga-eme ka ha maa jijiji;+ n’ihi na ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha ekwuwo ya.+