Ndị Efesọs
4 Ya mere, mụ onwe m, bụ́ onye mkpọrọ+ n’ime Onyenwe anyị, na-arịọsi unu ike ka unu na-eje ije n’ụzọ kwesịrị+ òkù ahụ a kpọrọ unu,+ 2 n’ịdị umeala n’obi na ịdị nwayọọ zuru ezu,+ n’ogologo ntachi obi,+ jirikwa ịhụnanya na-ediri ibe unu ihe,+ 3 na-agbasi mbọ ike ka unu nọgide n’ịdị n’otu nke mmụọ nsọ, n’ihe nkekọ nke bụ́ udo.+ 4 E nwere otu ahụ́,+ nweekwa otu mmụọ nsọ,+ ọbụna dị ka a kpọrọ unu n’otu olileanya+ ahụ nke a kpọrọ unu ka unu nweta; 5 otu Onyenwe anyị,+ otu okwukwe,+ otu baptizim;+ 6 otu Chineke+ na Nna nke mmadụ niile, onye bụ́ isi nke mmadụ niile na onye na-arụ ọrụ site n’aka mmadụ niile nakwa n’ime mmadụ niile.
7 Ma e nyere onye ọ bụla n’ime anyị obiọma na-erughịrị mmadụ+ dị ka Kraịst si tụọ onyinye ahụ e nyere n’efu n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀.+ 8 Ya mere, o kwuru, sị: “Mgbe ọ rịgooro n’elu, ọ dọọrọ ọtụtụ ndị n’agha; o nyere onyinye n’ụdị mmadụ.”+ 9 Ma okwu ahụ bụ́ “ọ rịgooro,”+ gịnị ka ọ pụtara ma ọ bụghị na ọ rịdatakwara n’ebe dị ala, ya bụ, ụwa?+ 10 Otu onye ahụ nke rịdatara bụkwa onye ahụ nke rịgooro+ n’ebe dị elu karịa eluigwe niile,+ ka o wee mee ka ihe niile zuo ezu.+
11 O nyere ụfọdụ ka ha bụrụ ndịozi,+ nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị amụma,+ nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị na-ezisa ozi ọma,+ nyekwa ụfọdụ ka ha bụrụ ndị ọzụzụ atụrụ na ndị ozizi,+ 12 iji na-agbazi+ ndị nsọ, maka ọrụ ije ozi, maka iwuli ahụ́ nke Kraịst elu,+ 13 ruo mgbe anyị niile ga-adị n’otu n’okwukwe nakwa n’ezi ihe ọmụma banyere Ọkpara Chineke, ruo mgbe anyị ghọrọ dimkpa,+ ruo mgbe anyị toruru otú Kraịst toruru;+ 14 ka anyị wee ghara ịbụkwa ụmụ ọhụrụ, ndị ebili mmiri na-enugharị+ na ndị ifufe ozizi ọ bụla+ na-ebugharị, site n’aghụghọ+ nke ụmụ mmadụ, site ná njehie e ji aghụghọ chepụta. 15 Kama n’ikwu eziokwu,+ ka anyị site n’ịhụnanya tolite+ n’ihe niile n’ime onye ahụ bụ́ isi,+ ya bụ, Kraịst. 16 Ọ bụ site n’aka ya ka ahụ́ dum,+ site n’ịbụ nke e jikọrọ ọnụ n’otu, nke e mekwara ka o kwenyekọọ site na nkwonkwo ọ bụla nke na-enye ihe dị mkpa, dị ka ịrụ ọrụ nke akụkụ ahụ́ nke ọ bụla n’otu n’otu si dị n’ọ̀tụ̀tụ̀ kwesịrị ekwesị, na-eme ka ahụ́ na-eto eto maka iwuli onwe ya elu n’ịhụnanya.+
17 Ya mere, ihe m na-ekwu ma na-agba àmà ya n’ime Onyenwe anyị bụ ka unu ghara ịnọgide na-eje ije dị nnọọ ka ndị mba ọzọ+ na-ejekwa n’echiche na-abaghị uru nke uche ha,+ 18 ebe ha nọ n’ọchịchịrị n’uche,+ bụrụkwa ndị e kewapụrụ+ ná ndụ nke si n’aka Chineke, n’ihi amaghị ihe+ nke dị n’ime ha, n’ihi na ihe adịghị emetụ ha n’obi.+ 19 Ebe ọ bụ na mmehie ha adịkwaghị ewute ha,+ ha mikpuru onwe ha n’omume rụrụ arụ+ iji anyaukwu+ na-eme ụdị omume adịghị ọcha niile.+
20 Ma unu amụtaghị Kraịst dị ka onye dị otú ahụ,+ 21 ma ọ bụrụhaala na unu nụrụ ihe o kwuru ma bụrụ ndị e sitere n’aka ya zie ihe,+ dị nnọọ ka eziokwu+ dị n’ime Jizọs, 22 na unu kwesịrị iyipụ mmadụ ochie ahụ,+ nke kwekọrọ n’ụzọ unu si eme omume n’oge gara aga, bụrụkwa nke a na-emerụ+ dị ka ọchịchọ aghụghọ ya si dị;+ 23 kama nke ahụ, unu kwesịrị ime ka ike nke na-eduzi uche unu dị ọhụrụ,+ 24 unu kwesịkwara iyiri+ mmadụ ọhụrụ+ ahụ nke e kere+ dị ka uche Chineke si dị, n’ezi omume+ na iguzosi ike n’ihe.
25 Ya mere, ebe unu hapụworo okwu ụgha,+ ka onye ọ bụla n’ime unu na-agwa onye agbata obi ya eziokwu,+ n’ihi na anyị bụ akụkụ dị iche iche nke otu ahụ́.+ 26 Weenụ iwe, ma unu emehiela;+ unu anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara,+ 27 unu enyekwala Ekwensu ohere.+ 28 Ka onye na-ezu ohi kwụsị izu ohi,+ kama ka ọ rụsie ọrụ ike, jiri aka ya na-arụ ọrụ ọma,+ ka o wee nwee ihe ọ ga-ekenye onye nọ ná mkpa.+ 29 Ka okwu rere ure ghara isi unu n’ọnụ pụta,+ kama nke ahụ, ka ọ bụrụ okwu dị mma maka iwuli elu dị ka ọ pụrụ ịdị mkpa, ka o wee mee ka ndị na-anụ ya nweta ihe dị mma.+ 30 Unu adịkwala na-eme ka mmụọ nsọ Chineke nwee mwute,+ bụ́ nke e ji kaa unu akara+ maka ụbọchị a ga-eji ihe mgbapụta tọhapụ unu.+
31 Wepụnụ obi ilu+ niile na iwe na ọnụma na iti mkpu na okwu mkparị,+ tinyere ihe ọjọọ niile, n’etiti unu.+ 32 Ma nweenụ obiọma+ n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko,+ na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam dị nnọọ ka Chineke sikwa n’aka Kraịst gbaghara unu kpamkpam.+