-
Ọpụpụ 10:19Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
19 Jehova wee mee ka e nwee oké ifufe nke si n’ebe ọdịda anyanwụ, o wee bupụ igurube ndị ahụ ma buba ha n’Oké Osimiri Uhie. Ọ dịghịkwa otu igurube a hapụrụ n’ókèala Ijipt dum.
-
-
Aịzaya 50:2Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
2 Gịnị mere na o nweghị onye nọ+ mgbe m batara? Gịnị mere na ọ dịghị onye zara+ mgbe m kpọrọ òkù? Aka m ọ̀ dịla mkpụmkpụ nke na ọ pụghị ịgbapụta unu,+ ka ọ̀ bụ na mụ adịghị ike ịnapụta unu? Lee! M na-eji ịba mba m+ eme ka oké osimiri taa;+ m na-eme ka osimiri ghọọ ala ịkpa.+ Azụ̀ dị na ha na-esi ísì n’ihi na mmiri adịghị, ha na-anwụkwa n’ihi agụụ mmiri.+
-