14 O wee dọrọ Jeruselem dum n’agha,+ tinyere ndị isi niile+ na ndị dimkpa niile bụ́ ndị dike+—puku mmadụ iri ka ọ dọọrọ n’agha—nakwa onye ọ bụla bụ́ omenkà+ na onye na-ewu mgbidi siri ike. Ọ dịghị onye a hapụrụ ma e wezụga ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha+ n’ime ndị ala ahụ.
14 Nke a bụ ihe Jehova, Onye Mgbapụta unu,+ bụ́ Onye Nsọ Izrel,+ kwuru: “Ọ bụ n’ihi unu ka m ga-eziga ha na Babịlọn ma mee ka ihe e ji tụchie ụlọ mkpọrọ dapụsịa,+ kwatuokwa ndị Kaldia nọ n’ụgbọ mmiri, ha ewee na-eti mkpu ákwá.+