6 N’afọ nke itoolu nke ọchịchị Hoshia, eze Asiria weghaara Sameria,+ dọrọkwa Izrel n’agha+ laa Asiria ma mee ka ha biri na Hela+ nakwa na Hebọ, nke dị n’akụkụ osimiri Gozan+ nakwa n’obodo dị iche iche nke ndị Midia.+
14 N’ihi na m ga-adị ka nwa ọdụm nye Ifrem,+ m ga-adịkwa ka nwa ọdụm tojuru etoju nye ụlọ Juda. Mụ onwe m ga-adọgbu ha, m ga-agakwa buru ha, ọ dịghịkwa onye ga-anapụta ha.+