2 E nwere ọhụụ siri ike+ a kọọrọ m: Onye aghụghọ na-aghọ aghụghọ, onye na-ebukọrọ ihe mmadụ na-ebukọrọkwa ihe mmadụ.+ Ilam, gbagoo! Midia,+ nọchibido ya! Emewo m ka ude niile a na-asụ n’ihi ya kwụsị.+
16 Mpi iri+ ahụ na anụ ọhịa+ ahụ ị hụrụ ga-akpọ nwaanyị akwụna+ ahụ asị, laakwa ya n’iyi ma mee ka ọ gbara ọtọ, ha ga-erikwa anụ ya ma kpọọ ya ọkụ kpamkpam.+