Aịzaya
21 Okwu e kwuru megide ala ịkpa nke oké osimiri:+ O si n’ala ịkpa na-abịa, site n’ala dị egwu,+ otú oké ifufe+ nke na-efe n’ebe ndịda si aga. 2 E nwere ọhụụ siri ike+ a kọọrọ m: Onye aghụghọ na-aghọ aghụghọ, onye na-ebukọrọ ihe mmadụ na-ebukọrọkwa ihe mmadụ.+ Ilam, gbagoo! Midia,+ nọchibido ya! Emewo m ka ude niile a na-asụ n’ihi ya kwụsị.+ 3 Ọ bụ ya mere úkwù ji na-egbu m mgbu nke ukwuu.+ Anọ m n’ihe mgbu, dị ka ihe mgbu nke nwaanyị na-amụ nwa.+ Obi erughị m ala, n’ihi ya anaghị m anụ ihe; uche akpaghasịwo m, n’ihi ya anaghị m ahụ ụzọ. 4 Obi m awagharịwo; ana m ama jijiji n’ụjọ. E mewo ka chi ojiji nke na-amasịbu m ghọọ ihe na-eme ka m maa jijiji.+
5 Ka e doo tebụl n’usoro, ka a hazie oche, ka a na-eri, na-aṅụkwa!+ Bilienụ, unu ndị isi.+ Teenụ ọta mmanụ.+ 6 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova gwara m:
“Gaa, debe onye nche ka ọ na-akọ ihe ọ na-ahụ.”+
7 O wee hụ ụgbọ agha nke ịnyịnya abụọ na-adọkpụ, ụgbọ agha nke ịnyịnya ibu na-adọkpụ, ụgbọ agha nke kamel na-adọkpụ. O wee tọọ ntị n’ala ṅasie ntị ike. 8 O wee kwuo n’olu ike dị ka ọdụm,+ sị: “Jehova, n’ụlọ nche ka m na-eguzo mgbe niile n’ehihie, m na-eguzokwa n’ebe m na-anọ eche nche n’abalị ọ bụla.+ 9 Ma, lee, ụgbọ ịnyịnya agha, nke ndị mmadụ nọ na ya, na-abịa, nke ịnyịnya abụọ na-adọkpụ!”+
O wee malite ịsị: “Ọ dawo! Babịlọn adawo.+ A kụtuwo ihe oyiyi niile a pịrị apị nke chi ya n’ala!”+
10 Unu ndị m a zọchara azọcha nakwa nwa nke si n’ebe m na-azọcha mkpụrụ,+ akọworo m unu ihe m nụrụ n’ọnụ Jehova nke ụsụụ ndị agha, bụ́ Chineke Izrel.
11 Okwu e kwuru megide Duma: Ọ dị onye nọ na Sia na-etiku m,+ sị: “Onye nche, abalị kwanụ? Onye nche, abalị kwanụ?”+ 12 Onye nche wee sị: “Chi ga-abọ, chi ga-ejikwa. Ọ bụrụ na unu chọrọ ịjụ ase, jụọnụ. Bịanụ ọzọ!”
13 Okwu e kwuru megide mbara ọzara: Unu ga-arahụ n’oké ọhịa nke dị na mbara ọzara, unu ìgwè ndị njem nke ndị Didan.+ 14 Kuterenụ onye akpịrị na-akpọ nkụ mmiri. Unu ndị bi n’ala Tima,+ wetaranụ onye na-agba ọsọ ndụ nri ka o rie. 15 N’ihi na ọ bụ mma agha mere ha ji gbaa ọsọ, n’ihi mma agha a mịpụtara amịpụta, nakwa n’ihi ụta e kwere ekwe nakwa n’ihi otú agha si kpụrụ ọkụ n’ọnụ.
16 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova gwara m: “Tupu otu afọ agafee, dị ka afọ nke onye ọrụ e goro ego si dị,+ ebube dum nke Kida+ ga-ala n’iyi. 17 Ndị fọdụrụ n’ime ndị niile na-agba ụta, bụ́ ndị dike nke ụmụ Kida, ga-adịzi ole na ole,+ n’ihi na Jehova, bụ́ Chineke Izrel, ekwuwo ya.”+