Abụ Ọma 69:20 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 20 Nkọcha etiwaala m obi, ọnyá ya enweghịkwa ngwọta.+Anọ m na-atụ anya ka mmadụ meere m ebere, ma ọ dịghị onye meere m ebere;+Na-atụkwa anya ndị nkasi obi, ma o nweghị onye m hụrụ.+ Aịzaya 51:19 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 19 Ihe abụọ ndị a nọ na-adakwasị gị.+ Ònye ga-asị gị ndo?+ Ibukọrọ ihe gị na ibibi gị, agụụ na mma agha!+ Ònye ga-akasi gị obi?+ Abụ Ákwá 1:12 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 12 Ọ̀ bụ na o nweghị ihe nke a bụụrụ unu niile ndị na-agafe n’ụzọ? Leenụ anya hụrụ.+È nwere ihe mgbu yiri ihe mgbu e mere ka m nwee,+Bụ́ iru uju Jehova kpatara n’ụbọchị oké iwe ya?+
20 Nkọcha etiwaala m obi, ọnyá ya enweghịkwa ngwọta.+Anọ m na-atụ anya ka mmadụ meere m ebere, ma ọ dịghị onye meere m ebere;+Na-atụkwa anya ndị nkasi obi, ma o nweghị onye m hụrụ.+
19 Ihe abụọ ndị a nọ na-adakwasị gị.+ Ònye ga-asị gị ndo?+ Ibukọrọ ihe gị na ibibi gị, agụụ na mma agha!+ Ònye ga-akasi gị obi?+
12 Ọ̀ bụ na o nweghị ihe nke a bụụrụ unu niile ndị na-agafe n’ụzọ? Leenụ anya hụrụ.+È nwere ihe mgbu yiri ihe mgbu e mere ka m nwee,+Bụ́ iru uju Jehova kpatara n’ụbọchị oké iwe ya?+