19 O wee gbaa ụlọ ezi Chineke ọkụ+ ma kwatuo mgbidi+ Jeruselem; ha gbakwara ụlọ elu ya niile ọkụ, gbaakwa arịa ya niile dị oké ọnụ ahịa ọkụ,+ iji bibie ihe niile.+
29 Ndị Kaldia, bụ́ ndị na-ebuso obodo a agha, ga-abata mụnye obodo a ọkụ wee gbaa ya ọkụ,+ tinyere ụlọ ndị dị n’elu ụlọ bụ́ ebe ha nọ na-esurere Bel ihe nsure ọkụ, na-awụsakwara chi ọzọ dị iche iche àjà ihe ọṅụṅụ iji kpasuo m iwe.’+
14 Izrel wee chefuo Onye kere ya,+ ọ na-ewukwa ụlọ nsọ dị iche iche;+ Juda wukwara ọtụtụ obodo siri ike.+ M ga-eziga ọkụ n’obodo ya niile, ọ ga-erepịakwa ụlọ elu niile dị na nke ọ bụla n’ime ha.”+