Levitikọs 26:29 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 29 Unu ga-eri anụ ụmụ unu ndị ikom, unu ga-erikwa anụ ụmụ unu ndị inyom.+ Diuterọnọmi 28:53 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 53 Mgbe ahụ, ị ga-eri mkpụrụ nke afọ gị, bụ́ anụ ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom,+ bụ́ ndị Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị, n’ihi otú nnọchibido ndị iro gị ga-anọchibido gị ga-esi siere gị ike ma nye gị nsogbu. Jeremaya 19:9 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 9 M ga-eme ka ha rie anụ ụmụ ha ndị ikom na anụ ụmụ ha ndị inyom; onye ọ bụla n’ime ha ga-eri anụ mmadụ ibe ya, n’ihi otú nnọchibido ndị iro ha na ndị na-achọ mkpụrụ obi ha ga-anọchibido ha ga-esi siere ha ike ma nye ha nsogbu.”’+ Abụ Ákwá 4:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Ndị inyom nwere ọmịiko ejiriwo aka ha sie ụmụ ha.+Ha aghọọla nri ngụgụ obi n’oge e bibiri ada bụ́ ndị m.+
53 Mgbe ahụ, ị ga-eri mkpụrụ nke afọ gị, bụ́ anụ ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom,+ bụ́ ndị Jehova bụ́ Chineke gị nyere gị, n’ihi otú nnọchibido ndị iro gị ga-anọchibido gị ga-esi siere gị ike ma nye gị nsogbu.
9 M ga-eme ka ha rie anụ ụmụ ha ndị ikom na anụ ụmụ ha ndị inyom; onye ọ bụla n’ime ha ga-eri anụ mmadụ ibe ya, n’ihi otú nnọchibido ndị iro ha na ndị na-achọ mkpụrụ obi ha ga-anọchibido ha ga-esi siere ha ike ma nye ha nsogbu.”’+
10 Ndị inyom nwere ọmịiko ejiriwo aka ha sie ụmụ ha.+Ha aghọọla nri ngụgụ obi n’oge e bibiri ada bụ́ ndị m.+