Abụ Ákwá
א [Alef]
ב [Bet]
2 Ụmụ Zayọn ndị dị nnọọ oké ọnụ ahịa,+ ndị dịbu ka ọlaedo a nụchara anụcha,
Lee ka e sizi were ha dị ka nnukwu ite ụrọ, bụ́ ọrụ aka nke ọkpụite!+
ג [Gimel]
3 Ọbụna nkịta ọhịa na-enye ụmụ ha ara. Ha na-enye ụmụ ha ara.
Ada bụ́ ndị m aghọọla ndị obi tara mmiri,+ dị ka enyí nnụnụ nọ n’ala ịkpa.+
ד [Dalet]
4 Ire nwa na-aṅụ ara araparawo n’okpo ọnụ ya n’ihi akpịrị ịkpọ nkụ.+
Ụmụntakịrị arịọwo ka e nye ha nri.+ Ma ọ dịghị onye na-enye ha.+
ה [Hee]
5 Ndị na-eri ihe dị ụtọ anọrọwo ná mgbagwoju anya n’okporo ámá.+
Ndị na-eyi ákwà dị oké ọnụ ahịa* malite mgbe ha bụ ụmụaka+ amakpuruwo n’ikpo ntụ.+
ו [Wọọ]
6 Ntaramahụhụ e nyere ada bụ́ ndị m maka njehie ha dị ukwuu karịa ntaramahụhụ e nyere Sọdọm maka mmehie ya,+
Bụ́ obodo a kwaturu n’otu ntabi anya, n’enweghị onye nyeere ya aka.+
ז [Zayin]
7 Ndị Naziraịt+ ya dịbu ọcha karịa snoo;+ ha na-achabu ọcha karịa mmiri ara ehi.
Ha na-achabu uhie uhie+ karịa nkume kọral; ha na-egbukekwa egbuke dị ka nkume safaya.+
ח [Het]
8 Ha na-ejizi oji karịa ọchịchịrị. A dịghịkwa amata ha n’okporo ámá.+
Ha atawo ahụ́ bụrụzie ọkpụkpụ ọkpụkpụ.+ Ha akpọọla nkụ dị ka osisi.
ט [Tet]
9 Ọ kaara ndị mma agha gburu mma+ karịa ndị ụnwụ gburu,+
N’ihi na ume na-agwụ ha maka na ihe si n’ubi adịkwaghị, ha wee yie ndị e ji ube magbuo.
י [Yod]
10 Ndị inyom nwere ọmịiko ejiriwo aka ha sie ụmụ ha.+
Ha aghọọla nri ngụgụ obi n’oge e bibiri ada bụ́ ndị m.+
כ [Kaf]
11 Jehova awụpụwo ọnụma ya dum.+ Ọ wụpụwo iwe ya dị ọkụ.+
O sunyewokwa Zayọn ọkụ, bụ́ nke na-erechapụ ntọala ya.+
ל [Lamed]
12 Ndị eze ụwa na ndị niile bi n’elu ala ekwetaghị+
Na onye mmegide na onye iro ga-abata n’ọnụ ụzọ ámá Jeruselem.+
מ [Mem]
13 N’ihi mmehie nke ndị amụma ya, njehie nke ndị nchụàjà ya,+
Ndị na-awụfu ọbara ndị ezi omume nọ n’ime ya.+
נ [Nun]
14 Ha awagharịala n’okporo ámá+ dị ka ndị kpuru ìsì.+ E jiriwo ọbara metọọ ha,+
N’ihi ya, ọ dịghị onye pụrụ imetụ uwe ha aka.+
ס [Samek]
15 “Pụọnụ n’ụzọ! Unu ndị na-adịghị ọcha!”+ ka ha gwara ha n’olu dara ụda. “Pụọnụ n’ụzọ! Pụọnụ n’ụzọ! Unu emetụla anyị aka!”+
N’ihi na ha enwekwaghị ebe obibi.+ Ha awagharịala.+ Ndị mmadụ ekwuwo n’etiti mba dị iche iche, sị: “Ha agaghị ebi ọzọ dị ka ndị ọbịa.+
פ [Pee]
16 Jehova achụsasịwo ha.+ Ọ gaghị elekwasị ha anya ọzọ.+
Ndị mmadụ agaghị asọpụrụ ọbụna ndị nchụàjà.+ Ha agaghị emere ọbụna ndị agadi amara.”+
ע [Ayin]
17 Anya akpọọla anyị ebe anyị nọ na-ele anya n’efu maka enyemaka.+
Mgbe anyị na-elegharị anya, anyị elekwasịwo anya ná mba nke na-apụghị iweta nzọpụta.+
צ [Sadee]
18 Ha na-esogharị nzọụkwụ anyị+ ka ha jide anyị, nke na ọ dịghị onye na-ejegharị n’ámá obodo anyị.
Ọgwụgwụ anyị eruwo nso. Ụbọchị anyị agwụchaala, n’ihi na ọgwụgwụ anyị eruola.+
ק [Kof]
19 Ndị na-achụ anyị na-efe ọsọ karịa ugo nke eluigwe.+
Ha achụwo anyị ajọ ọsọ n’elu ugwu.+ Ha echechiela anyị n’ala ịkpa.+
ר [Resh]
20 E jidewo ume anyị na-eku,+ bụ́ onye Jehova tere mmanụ,+ ná nnukwu olulu ha,+
Onye anyị kwuru banyere ya, sị: “Na ndò ya+ ka anyị ga-ebi n’etiti mba dị iche iche.”+
ש [Sin]
21 Nwee obi ụtọ, ṅụrịakwa ọṅụ,+ gị ada bụ́ Idọm,+ nke dị n’ala Ọz.+
A ga-enyekwa gị iko ahụ.+ Mmanya ga na-egbu gị, ị ga-agbakwa onwe gị ọtọ.+
ת [Tọọ]