Diuterọnọmi 4:30 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 30 Mgbe ị nọ n’oké ihe isi ike, okwu a niile ewee mezuo n’isi gị mgbe ụbọchị ndị ahụ gwụwara, mgbe ahụ, ị ga-alaghachikwute Jehova bụ́ Chineke+ gị wee gee ntị n’olu ya.+ Abụ Ọma 80:3 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 3 Chineke, biko, kpọghachite anyị;+Mee ka ihu gị nwuo dị ka ìhè, ka e wee zọpụta anyị.+ Abụ Ọma 85:4 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 4 Chineke nke nzọpụta anyị, biko, kpọghachite anyị, +Kwụsịkwa iwe ị na-eweso anyị.+ Jeremaya 31:18 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 18 “Anụwo m ka Ifrem na-akwa ákwá arịrị,+ sị, ‘Ị gbaziwo m, ka m wee bụrụ onye a gbaziri agbazi,+ dị ka nwa ehi a na-azụghị azụ.+ Kpọghachite m, m ga-alọghachikwa,+ n’ihi na ị bụ Jehova bụ́ Chineke m.+ Jeremaya 32:37 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 37 ‘Lee, m ga-esi n’ala niile m ji iwe na ọnụma na oké iwe+ chụga ha kpọkọta ha; m ga-akpọlata ha n’ebe a, meekwa ka ha biri n’obi iru ala.+
30 Mgbe ị nọ n’oké ihe isi ike, okwu a niile ewee mezuo n’isi gị mgbe ụbọchị ndị ahụ gwụwara, mgbe ahụ, ị ga-alaghachikwute Jehova bụ́ Chineke+ gị wee gee ntị n’olu ya.+
18 “Anụwo m ka Ifrem na-akwa ákwá arịrị,+ sị, ‘Ị gbaziwo m, ka m wee bụrụ onye a gbaziri agbazi,+ dị ka nwa ehi a na-azụghị azụ.+ Kpọghachite m, m ga-alọghachikwa,+ n’ihi na ị bụ Jehova bụ́ Chineke m.+
37 ‘Lee, m ga-esi n’ala niile m ji iwe na ọnụma na oké iwe+ chụga ha kpọkọta ha; m ga-akpọlata ha n’ebe a, meekwa ka ha biri n’obi iru ala.+