27 N’ụbọchị ahụ, ị ga-emeghere onye ahụ gbapụrụ agbapụ ọnụ gị,+ ị ga-ekwu okwu, ị gaghị agba nkịtị ọzọ;+ ị ga-abụkwara ha ihe àmà+ nke ihe ga-eme n’ọdịnihu. Ha ga-amarakwa na mụ onwe m bụ Jehova.”+
22 Ma mgbe ọ pụtara, o nweghị ike ịgwa ha okwu, ha wee ghọta na ọ ka hụchara ihe dị ebube+ n’ebe nsọ ahụ; o wee jiri aka na-agwa ha okwu, ma ọ ka dara ogbi.