Luk
1 Ebe ọtụtụ ndị gbalịworo ide ihe ndị mere eme+ bụ́ ndị anyị kwenyezuru, 2 dị nnọọ ka ndị ji anya ha hụ+ ihe ndị a site ná mmalite,+ ndị kwusakwara ozi ahụ,+ nyefere anyị ihe ndị a, 3 ekpebikwara m idetara gị ihe ndị a n’usoro n’usoro,+ gị Tiofilọs+ onye ukwu,+ n’ihi na esi m ná mmalite nyochaa ihe niile n’ụzọ ziri ezi, 4 ka i wee mara n’ụzọ zuru ezu na ihe niile e ji ọnụ kụziere gị bụ eziokwu.+
5 N’ụbọchị Herọd,+ bụ́ eze Judia, e nwere otu onye nchụàjà aha ya bụ Zekaraya nke nọ n’ìgwè nke Abaịja.+ O nwekwara nwunye onye bụ́ otu n’ime ụmụ Erọn.+ Aha ya bụ Elizabet. 6 Ha abụọ bụ ndị ezi omume+ n’ihu Chineke n’ihi na ha na-eje ije otú a na-apụghị ịta ha ụta,+ dị ka iwu+ na ntụziaka+ niile nke Jehova si dị.+ 7 Ma ha enweghị nwa, n’ihi na Elizabet bụ nwaanyị aga,+ ha abụọ emewokwa agadi.
8 Ma ka ọ nọ na-arụ ọrụ dị ka onye nchụàjà n’ebe e kenyere ìgwè nke ya ọrụ+ n’ihu Chineke, 9 dị ka ndị nchụàjà na-eme, o ruuru ya isure ihe na-esi ísì ụtọ n’ọkụ+ mgbe ọ banyere n’ebe nsọ Jehova;+ 10 ìgwè mmadụ niile nọkwa na-ekpe ekpere n’èzí n’oge awa e ji esure ihe na-esi ísì ụtọ n’ọkụ.+ 11 Mmụọ ozi Jehova pụtara ìhè n’ihu ya wee guzoro n’akụkụ aka nri nke ebe ịchụàjà nke ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ.+ 12 Ma ihe Zekaraya hụrụ malitere inye ya nsogbu, egwu wee jide ya.+ 13 Otú ọ dị, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Zekaraya, atụla egwu, n’ihi na a nụwo arịrịọ ị na-arịọsi ike,+ nwunye gị bụ́ Elizabet ga-amụkwara gị nwa nwoke, ị ga-akpọkwa aha ya Jọn.+ 14 Ị ga-enwekwa ọṅụ na oké obi ụtọ, ọtụtụ ndị ga-aṅụrịkwa ọṅụ+ n’ihi ọmụmụ ya; 15 n’ihi na ọ ga-abụ onye ukwu n’ihu Jehova.+ Ma ọ gaghị aṅụ mmanya na ihe ọṅụṅụ ọ bụla na-egbu egbu ma ọlị,+ ọ ga-ejupụtakwa na mmụọ nsọ malite n’afọ nne ya;+ 16 ọ ga-eme ka ọtụtụ ụmụ Izrel chigharịkwuru Jehova+ bụ́ Chineke ha. 17 Ọ ga-ejikwa mmụọ na ike Ịlaịja+ butere ya ụzọ, iji mee ka obi+ nke ndị bụ́ nna chigharikwuru ụmụ ha, meekwa ka ndị na-enupụ isi nwee ezi amamihe nke ndị ezi omume, iji kwadebere Jehova+ otu ndị.”+
18 Zekaraya wee gwa mmụọ ozi ahụ, sị: “Olee otú m ga-esi jide nke a n’aka? N’ihi na akawo m nká,+ nwunye m emewokwa agadi.” 19 Mmụọ ozi ahụ wee zaa ya, sị: “Abụ m Gebriel,+ onye na-eguzo n’ihu Chineke, e zitere m ka m gwa gị okwu+ ma zie gị ozi ọma banyere ihe ndị a. 20 Ma, lee! ị ga-ada ogbi,+ ị gaghịkwa enwe ike ikwu okwu ruo ụbọchị ihe ndị a ga-eme, n’ihi na i kweghị ihe m kwuru, bụ́ ndị a ga-emezu n’oge ha a kara aka.” 21 Ka nke a na-eme, mmadụ niile nọ na-echere Zekaraya,+ oge ọ na-egbu n’ebe nsọ ahụ malitekwara iju ha anya. 22 Ma mgbe ọ pụtara, o nweghị ike ịgwa ha okwu, ha wee ghọta na ọ ka hụchara ihe dị ebube+ n’ebe nsọ ahụ; o wee jiri aka na-agwa ha okwu, ma ọ ka dara ogbi. 23 Ma, mgbe ụbọchị nke ya maka ijere ọha mmadụ ozi zuru,+ ọ lawara n’ụlọ ya.
24 Ma mgbe ụbọchị ndị a gasịrị, Elizabet nwunye ya tụụrụ ime;+ o wee nọrọ n’ụlọ n’apụtaghị apụta ruo ọnwa ise, sị: 25 “Nke a bụ ụzọ Jehova si meso m ihe n’ụbọchị ndị a o chere ihu n’ebe m nọ iji wepụ nkọcha ndị mmadụ na-akọcha m.”+
26 N’ọnwa nke isii ya, Chineke zipụrụ mmụọ ozi Gebriel+ ka ọ gaa n’obodo Galili nke a na-akpọ Nazaret, 27 ka ọ gakwuru nwa agbọghọ na-amaghị nwoke nke e kwere nkwa na otu nwoke aha ya bụ Josef ga-alụ, bụ́ onye si n’ụlọ Devid; aha nwa agbọghọ ahụ na-amaghị nwoke+ bụ Meri.+ 28 Mgbe ọ gakwuuru ya, ọ sịrị ya: “Ndeewo,+ onye e meere amara dị ukwuu, Jehova+ nọnyeere gị.”+ 29 Ma okwu ahụ nyere ya nsogbu nke ukwuu, o wee malite ịtụle ụdị ekele nke a pụrụ ịbụ. 30 Ya mere, mmụọ ozi ahụ sịrị ya: “Atụla egwu, Meri, n’ihi na Chineke meere gị amara;+ 31 lee! ị ga-atụrụ ime, mụọ nwa nwoke,+ ị ga-agụkwa ya Jizọs.+ 32 Onye a ga-abụ onye ukwu,+ a ga-akpọkwa ya Ọkpara nke Onye Kasị Elu;+ Jehova Chineke ga-enyekwa ya ocheeze+ Devid bụ́ nna ya,+ 33 ọ ga-achịkwa ụlọ Jekọb dị ka eze ruo mgbe ebighị ebi, alaeze ya agaghịkwa enwe ọgwụgwụ.”+
34 Ma Meri sịrị mmụọ ozi ahụ: “Olee otú nke a ga-esi mee, ebe ọ bụ na mụ na nwoke ọ bụla enwetụbeghị mmekọahụ?”+ 35 Mmụọ ozi ahụ zara ya, sị: “Mmụọ nsọ+ ga-abịakwasị gị, ike nke Onye Kasị Elu ga-ekpuchikwa gị. N’ihi nke ahụ, a ga-akpọ onye ahụ a ga-amụ onye nsọ,+ Ọkpara Chineke.+ 36 Ma, lee! Elizabet onye ikwu gị atụrụwokwa ime nwa nwoke n’agadi ya, bụ́ onye a sị na ọ bụ nwaanyị aga, nke a bụkwa ọnwa nke isii ya;+ 37 n’ihi na, n’ebe Chineke nọ, ọ dịghị okwu ọ bụla e kwupụtaworo nke ga-abụ ihe na-apụghị ime eme.”+ 38 Meri wee sị: “Lee! Abụ m nwa agbọghọ bụ́ ohu Jehova!+ Ka o mee dị ka i kwuru.” Mmụọ ozi ahụ wee si n’ebe ọ nọ pụọ.
39 Ya mere, Meri biliri n’ụbọchị ndị a ma banye ngwa ngwa n’ógbè bụ́ ugwu ugwu, n’otu obodo Juda, 40 o wee banye n’ụlọ Zekaraya ma kelee Elizabet. 41 Ka Elizabet nụrụ ekele Meri, nwa nọ ya n’afọ maliri; Elizabet jupụtakwara na mmụọ nsọ, 42 o wee tie mkpu n’olu dara ụda, sị: “Onye a gọziri agọzi ka ị bụ n’etiti ndị inyom, ihe a gọziri agọzi+ ka mkpụrụ nke afọ gị bụkwa! 43 Ya mere, olee otú o si bụrụ na m nwetara ihe ùgwù a, na nne nke Onyenwe m+ bịakwutere m? 44 N’ihi na, lee! ka m nụrụ ụda ekele gị, nwa nọ m n’afọ maliri n’obi ụtọ.+ 45 Obi ụtọ na-adịkwara nwaanyị nke kweere, n’ihi na a ga-emezucha+ ihe ndị ahụ a gwara ya site n’ebe Jehova nọ.”+
46 Meri wee sị: “Mkpụrụ obi m na-eto Jehova,+ 47 mmụọ m apụghịkwa ịkwụsị inwe oké ọṅụ+ n’ebe Chineke bụ́ Onye Nzọpụta m nọ;+ 48 n’ihi na o lekwasịwo anya n’ọnọdụ dị ala nke ohu ya nwaanyị.+ N’ihi na, lee! site ugbu a gaa n’ihu, ọgbọ niile ga-akpọ m onye obi ụtọ;+ 49 n’ihi na Onye ahụ nke dị ike emeworo m oké ihe dị iche iche, aha ya dịkwa nsọ;+ 50 sitekwa n’ọgbọ ruo n’ọgbọ ebere ya na-adịkwasị ndị na-atụ egwu ya.+ 51 O jiriwo ogwe aka ya rụọ oké ọrụ,+ ọ chụsasịwo ndị dị mpako n’ihe ha bu n’obi.+ 52 Ọ kwatuwo ndị nwere ike+ n’ocheeze, buliekwa ndị ọ na-enweghị ka ọ hà ha elu;+ 53 o werewo ihe ọma nyejuo ndị agụụ na-agụ afọ,+ o mewokwa ka ndị nwere akụ̀ gbara aka laa.+ 54 Ọ gbataworo Izrel bụ́ ohu ya ọsọ enyemaka,+ iji cheta ebere+ 55 ọ ga-emere Ebreham na mkpụrụ ya ruo mgbe ebighị ebi, dị nnọọ ka ọ gwara nna nna anyị hà.”+ 56 Meri wee nọnyere ya ruo ihe dị ka ọnwa atọ, wee laghachi n’ụlọ nke ya.
57 Oge ruru ka Elizabet mụọ nwa. O wee mụọ nwa nwoke. 58 Ndị agbata obi na ndị ikwu ya nụkwara na Jehova emeworo ya ebere ya dị ukwuu,+ ha wee soro ya na-aṅụrị ọṅụ.+ 59 N’ụbọchị nke asatọ, ha bịara ibi nwatakịrị ahụ úgwù,+ ha chọkwara ịgụ ya aha nna ya, bụ́ Zekaraya. 60 Ma nne ya sịrị: “Ee e! kama a ga-agụ ya Jọn.” 61 Mgbe o kwuru nke a, ha sịrị ya: “E nweghị onye ọ bụla n’etiti ndị ikwu gị nke a na-akpọ aha a.” 62 Ha wee jiri aka na-ajụ nna ya ihe ọ chọrọ ka a kpọọ ya. 63 O wee sị ka e nye ya mbadamba ihe, o wee dee, sị: “Jọn+ bụ aha ya.” O wee ju ha niile anya. 64 Ọnụ ya meghere+ ozugbo, a tọghekwara ire ya, o wee malite ikwu okwu, na-agọzi Chineke. 65 Egwu wee jide ndị niile bi n’agbata obi ha; a malitekwara ịkọsasị ihe ndị a niile n’ógbè Judia dum bụ́ ugwu ugwu, 66 ndị niile nụrụ ya wee buru ya n’obi,+ wee sị: “Gịnị n’ezie ka nwatakịrị a ga-abụ?” N’ihi na aka+ Jehova dịnyeere ya.
67 Zekaraya bụ́ nna ya jupụtara na mmụọ nsọ,+ o wee buo amụma,+ sị: 68 “Ka Jehova bụ́ Chineke Izrel bụrụ onye a gọziri agọzi,+ n’ihi na o lebaworo ndị ya+ anya wee napụta ha.+ 69 O mewokwa ka mpi+ nzọpụta biliere anyị n’ụlọ Devid bụ́ ohu ya, 70 dị nnọọ ka o si n’ọnụ ndị amụma ya dị nsọ nke oge ochie+ kwuo okwu 71 banyere ịzọpụta anyị n’aka ndị iro anyị nakwa n’aka ndị niile kpọrọ anyị asị;+ 72 iji meere anyị ebere nke o kwere nna nna anyị hà ná nkwa, iji cheta ọgbụgba ndụ ya dị nsọ,+ 73 bụ́ iyi ọ ṅụụrụ Ebreham bụ́ nna nna anyị,+ 74 iji nye anyị ihe ùgwù nke ijere ya ozi dị nsọ n’atụghị egwu,+ mgbe a napụtasịrị anyị n’aka ndị iro,+ 75 bụ́ ozi anyị ga-eje n’ihu ya ụbọchị anyị niile n’iguzosi ike n’ihe na ezi omume.+ 76 Ma gị onwe gị, nwatakịrị, a ga-akpọ gị onye amụma nke Onye Kasị Elu, n’ihi na ị ga-ebute ụzọ gaa n’ihu Jehova iji kwadebe ụzọ ya,+ 77 iji mee ka ndị ya mata banyere nzọpụta site ná mgbaghara nke mmehie ha,+ 78 n’ihi obi ọmịiko nke Chineke anyị. N’ihi ọmịiko a, anyị ga-ahụ ìhè nke ga-esi n’eluigwe+ nwuo dị ka mgbe chi bọrọ,+ 79 iji nye ndị nọ ọdụ n’ọchịchịrị nakwa n’onyinyo ọnwụ ìhè,+ iji duru ụkwụ anyị gaa n’ụzọ nke udo, gọziekwa anyị na ya.”
80 Nwatakịrị ahụ wee na-eto,+ na-agbasikwa ike n’ime mmụọ, ọ nọgidekwara n’ọzara ruo ụbọchị o gosiri Izrel onwe ya n’ihu ọha.