48 ha ewee nọrọ n’ala ndị iro ha, bụ́ ndị dọọrọ ha n’agha, jiri obi ha dum+ na mkpụrụ obi ha dum lọghachikwute gị, ha ewee chee ihu n’ala ha bụ́ nke i nyere ndị nna nna ha, bụ́ obodo ị họọrọ nakwa n’ụlọ a m wuuru aha gị, kpekuo gị ekpere;+
14 ndị m+ bụ́ ndị a kpọkwasịrị aha m+ ewee weda onwe ha ala+ wee kpee ekpere+ ma chọọ ihu m,+ hapụkwa ụzọ ọjọọ ha,+ mụ onwe m ga-anọ n’eluigwe nụ+ wee gbaghara ha mmehie ha,+ m ga-agwọkwa ala ha.+
21 “‘Ọ bụrụ na onye ajọ omume ahapụ mmehie niile o mere,+ debe ụkpụrụ m niile, meekwa ihe ziri ezi na ezi omume,+ ọ ga-anọgide na-adị ndụ. Ọ gaghị anwụ.+