4 M ga-eme ka ị tụgharịa, tinyekwa nko n’agba gị+ wee dọrọ gị na ndị agha gị niile,+ ya bụ, ịnyịnya na ndị na-agba ịnyịnya, ha niile yi uwe mara mma,+ ìgwè mmadụ dị ukwuu, ndị ji ọta ukwu na ọta nta, ha niile bu mma agha;+
22 M ga-akwatukwa ocheeze nke alaeze dị iche iche, mee ka ike alaeze nke mba+ dị iche iche laa n’iyi; m ga-akwatukwa ụgbọ ịnyịnya+ na ndị na-agba ha, ịnyịnya na ndị na-agba ha ga-anwụkwa, onye ọ bụla site ná mma agha nwanne ya.’”+
18 ka unu wee rie anụ+ ndị eze na anụ ndị ọchịagha na anụ ndị dị ike+ na anụ ịnyịnya+ na nke ndị nọ n’elu ha, na anụ mmadụ niile, nke ndị nweere onwe ha na nke ndị ohu na nke ndị nta na ndị ukwu.”