-
Job 42:8Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
8 Ugbu a, werenụ oké ehi asaa na ebule asaa+ gakwuru ohu m bụ́ Job,+ chụọkwanụ àjà nsure ọkụ maka onwe unu; ohu m bụ́ Job ga-ekpere unu ekpere.+ Ọ bụ naanị ekpere ya ka m ga-anabata ka m wee ghara imenye unu ihere n’ihi nzuzu unu, n’ihi na unu ekwughị ihe bụ́ eziokwu banyere m dị ka ohu m bụ́ Job kwuru.”+
-
-
Ezikiel 20:40Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
40 “‘N’ihi na n’ugwu nsọ m, n’ugwu dị n’ebe dị elu n’Izrel,’+ ka Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova kwuru, ‘n’ebe ahụ ka ha onwe ha, ya bụ, ụlọ Izrel dum, ga-efe m, n’ala ha.+ N’ebe ahụ ka ihe ha ga-atọ m ụtọ, ọ bụkwa n’ebe ahụ ka m ga-achọ onyinye unu na mkpụrụ mbụ nke ihe unu na-enye, bụ́ ihe nsọ unu niile.+
-