Abụ Ọma 79:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 79 Chineke, ndị mba ọzọ abatawo n’ihe nketa gị;+Ha emerụwo ụlọ nsọ gị;+Ha emewo ka Jeruselem bụrụ mkpọmkpọ ebe.+ Aịzaya 64:10 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 10 Obodo nsọ gị niile+ aghọọla ala ịkpa. Zayọn+ aghọọla naanị ala ịkpa, Jeruselem aghọọkwa ebe tọgbọrọ n’efu.+ Jeremaya 7:34 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 34 M ga-eme ka a ghara ịnụkwa mkpu ọṅụ na mkpu obi ụtọ na olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem; n’ihi na ala a ga-aghọ naanị ebe a lara n’iyi.’”+ Abụ Ákwá 1:1 Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ 1 Ewoo, lee ka obodo nke ndị mmadụ jupụtaburu+ na ya si tọgbọrọ n’efu!+Lee ka nwaanyị nke nweburu ụba mmadụ n’etiti mba niile+ si yie nwaanyị di ya nwụrụ!+Lee ka onye bụbu eze nwaanyị n’etiti ógbè dị iche iche sizi bụrụ onye a na-amanye ịrụ ọrụ!+
79 Chineke, ndị mba ọzọ abatawo n’ihe nketa gị;+Ha emerụwo ụlọ nsọ gị;+Ha emewo ka Jeruselem bụrụ mkpọmkpọ ebe.+
10 Obodo nsọ gị niile+ aghọọla ala ịkpa. Zayọn+ aghọọla naanị ala ịkpa, Jeruselem aghọọkwa ebe tọgbọrọ n’efu.+
34 M ga-eme ka a ghara ịnụkwa mkpu ọṅụ na mkpu obi ụtọ na olu nwoke na-alụ nwaanyị ọhụrụ na olu nwaanyị a na-alụ ọhụrụ+ n’obodo ndị dị na Juda nakwa n’okporo ámá ndị dị na Jeruselem; n’ihi na ala a ga-aghọ naanị ebe a lara n’iyi.’”+
1 Ewoo, lee ka obodo nke ndị mmadụ jupụtaburu+ na ya si tọgbọrọ n’efu!+Lee ka nwaanyị nke nweburu ụba mmadụ n’etiti mba niile+ si yie nwaanyị di ya nwụrụ!+Lee ka onye bụbu eze nwaanyị n’etiti ógbè dị iche iche sizi bụrụ onye a na-amanye ịrụ ọrụ!+