6 Anyị wee yie onye na-adịghị ọcha, anyị niile, ezi omume anyị niile yikwara uwe e yi mgbe a na-ahụ nsọ;+ anyị ga-akpọnwụ dị ka mkpá akwụkwọ,+ anyị niile, njehie anyị ga-ebufukwa anyị dị ka ifufe.+
7 Jehova, ọ bụrụgodị na njehie anyị na-agbagide anyị akaebe, biko, mee ihe n’ihi aha gị;+ n’ihi na ekwesịghị ntụkwasị obi anyị adịwo ukwuu;+ ọ bụ gị ka anyị mehiere.+