16 N’oge ahụ, ndị na-atụ egwu Jehova+ nọ na-akparịta ụka, otu onye na ibe ya, Jehova nọkwa na-ege ntị ma na-anụ ihe ha na-ekwu.+ E wee malite ide akwụkwọ ncheta n’ihu ya+ maka ndị na-atụ egwu Jehova nakwa maka ndị na-echebara aha ya echiche.+
20 Otú o sina dị, unu aṅụrịla ọṅụ n’ihi nke a, na a na-eme ka mmụọ dị iche iche nọrọ n’okpuru unu, kama ṅụrịanụ ọṅụ n’ihi na e dewo aha+ unu n’eluigwe.”
23 ná mgbakọ ezumezu+ nakwa n’ọgbakọ nke ndị e bu ụzọ mụọ,+ bụ́ ndị e dere aha ha+ n’akwụkwọ n’eluigwe, na Chineke bụ́ Onyeikpe nke mmadụ niile,+ na ndụ ime mmụọ+ nke ndị ezi omume ndị e mere ka ha zuo okè,+
5 A ga-esikwa otú ahụ yiwe onye meriri emeri+ uwe elu nke na-acha ọcha;+ m gaghịkwa ehichapụ aha ya ma ọlị n’akwụkwọ nke ndụ,+ kama m ga-ekwupụta aha ya n’ihu Nna m+ na n’ihu ndị mmụọ ozi ya.+