12 M ga-eme ka osisi vaịn ya+ na osisi fig ya+ tọgbọrọ n’efu, bụ́ ndị o kwuru banyere ha, sị: “Ha bụ onyinye ndị mụ na ha na-eme enyi nyere m”; m ga-emekwa ka ha dị ka oké ọhịa,+ anụ ọhịa ga-erichapụ ha.
7 A ga-akụrikwa ihe oyiyi ya a pịrị apị,+ kpọọkwa onyinye niile e ji kwụọ ya ụgwọ ọkụ;+ m ga-ebibikwa arụsị ya niile. N’ihi na o si n’ihe ọ gbatara n’akwụna nweta ha, ọ bụkwa n’ihe a gbatara n’akwụna ka ha ga-alaghachi.”+