5 N’ihi na nne ha kwara iko.+ Onye buru ha n’afọ mere omume ihere,+ n’ihi na ọ sịrị, ‘Achọrọ m ịgakwuru ndị mụ na ha na-eme enyi,+ ndị na-enye m nri m na-eri na mmiri m na-aṅụ, ajị anụ m na ákwà linin m, mmanụ m na ihe ọṅụṅụ m.’+
9“Izrel, aṅụrịla ọṅụ.+ Enwela aṅụrị dị ka ndị dị iche iche.+ N’ihi na ịkwa iko emewo ka i si n’akụkụ Chineke gị pụọ.+ Ụgwọ a na-akwụ gị n’ebe niile a na-azọcha ọka* masịrị gị.+