18 ka e wee ghara inwe taa n’etiti unu nwoke ma ọ bụ nwaanyị ma ọ bụ ezinụlọ ma ọ bụ ebo nke obi ya na-esi n’ebe Jehova bụ́ Chineke anyị nọ pụọ ịga fee chi dị iche iche nke mba ndị ahụ ofufe;+ ka e wee ghara inwe mgbọrọgwụ nke na-amịpụta mkpụrụ osisi na-egbu mmadụ nakwa ahịhịa ilu n’etiti unu.+
7 N’ihi na ụlọ Izrel bụ ubi vaịn+ Jehova nke ụsụụ ndị agha, ndị Juda bụkwa ubi nke na-eme ya obi ụtọ.+ O wee na-atụ anya ikpe ziri ezi,+ ma, lee! ọ bụ mmebi iwu ka ọ hụrụ; ọ tụrụ anya ezi omume, ma, lee! ọ bụ iti mkpu ákwá ka ọ nụrụ.”+
12 “‘Ịnyịnya ọ̀ ga-agba ọsọ n’elu nkume dị elu, ka mmadụ ọ̀ ga-eji ehi kọọ ihe na ya? N’ihi na unu emewo ka ikpe ziri ezi ghọọ ahịhịa na-egbu mmadụ,+ meekwa ka mkpụrụ nke ezi omume ghọọ ahịhịa ilu,