31 Ya mere, ọgbakọ+ dị na Judia na Galili na Sameria dum banyere n’oge udo, e wee na-ewuli ya elu; ha nọgidekwara na-amụba ka ha na-eje ije n’egwu Jehova,+ na-adịkwa ndụ n’ụzọ kwekọrọ ná nkasi obi ha na-enweta site na mmụọ nsọ.+
28 Ya mere, ebe anyị ga-enweta alaeze nke a na-apụghị ime ka ọ maa jijiji,+ ka anyị na-enweta obiọma na-erughịrị mmadụ, nke anyị ga-esite na ya jiri egwu Chineke na ụjọ+ na-ejere Chineke ozi dị nsọ nke ọ na-anabata.