13 “Ebube Lebanọn, bụ́ osisi junipa, osisi ash, na osisi saịpres, ga-abịara gị n’otu mgbe ahụ,+ iji chọọ ebe nsọ m mma;+ m ga-emekwa ka ebe m gbakwasịrị ụkwụ dị ebube.+
12 N’ihi na nke a bụ ihe Jehova kwuru: “Lee, m ga-enye ya udo nke ga-adị ka osimiri,+ nyekwa ya ebube nke mba niile nke ga-adị ka iyi tojubigara ókè,+ unu ga-aṅụkwa ara.+ A ga-eku unu n’akụkụ, a ga-ekukwasị unu n’ikpere, na-adịda unu aka.+
6 Ma Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi dị ka Ọkpara+ nke na-elekọta ụlọ Onye ahụ.+ Anyị bụ ụlọ Onye ahụ, ma ọ bụrụ na anyị ejidesie nkwuwa okwu anyị ike, na ịnya isi anyị n’ihi olileanya ahụ, ruo ọgwụgwụ.+