52 Jizọs wee gwa ndị isi nchụàjà na ndị isi ndị nche ụlọ nsọ na ndị okenye chọ ya bịa ebe ahụ, sị: “Ùnu ji mma agha na okpiri bịa dị ka à ga-asị na unu bịara ijide onye na-apụnara mmadụ ihe?+
16 “Ụmụnna m, ọ dị mkpa ka ihe dị n’akụkụ Akwụkwọ Nsọ ahụ mezuo,+ bụ́ nke mmụọ nsọ+ kwuru tupu oge eruo site n’ọnụ Devid banyere Judas,+ onye ghọrọ onye duziri ndị jidere Jizọs,+