-
Mak 16:8Baịbụl Nsọ—Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ nke Akwụkwọ Nsọ
-
-
8 Ya mere, mgbe ha si n’ili ncheta ahụ pụta, ha ji ọsọ gbapụ, n’ihi na ha na-ama jijiji, nọrọkwa ná mgbagwoju anya. Ọ dịghịkwa onye ha gwara ihe ọ bụla, n’ihi na egwu na-atụ ha.+
MMECHI DỊ MKPIRIKPI
Ihe odide na nsụgharị ochie ụfọdụ nwere mmechi dị mkpirikpi nke sochiri Mak 16:8, nke kwuru, sị:
Ma ha kọọrọ ndị nọ Pita gburugburu ihe niile e nyere n’iwu ná nkenke. Mgbe ihe ndị a gasịrị, Jizọs zipụrụ ha ka ha gaa zisaa ozi banyere nzọpụta ebighị ebi, nke dị nsọ, nke a na-apụghịkwa ibibi ebibi, site n’ebe ọwụwa anyanwụ ruo n’ebe ọdịda anyanwụ.
-